YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 12

12
1Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu: 2Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon; 3na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga: 4na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei, 5nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon. 6Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.
7Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè; 8n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 9eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù; 10eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù: 11eze Jamut, otù; eze Lekish, otù; 12eze Eglon, otù; eze Gezea, otù; 13eze Debia, otù; eze Geda, otù; 14eze Họma, otù; eze Arad, otù; 15eze Libna, otù; eze Adulam, otù; 16eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù; 17eze Tapua, otù; eze Hefa, otù; 18eze Efek, otù; eze Lasharon, otù; 19eze Madon, otù; eze Hezoa, otù; 20eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù; 21eze Teanak, otù; eze Megido, otù; 22eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù; 23eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù; 24eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.

Currently Selected:

JOSHUA 12: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy