YouVersion Logo
Search Icon

DANIEL 4

4
1Nebukadneza, bú eze, nēzigara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ozi, bú ndi bi n'uwa nka nile; ka udo bara unu uba. 2Ihe-iriba-ama nile na ihe-iju-anya nile nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu meworo n'imesom, ọ dim nma n'anya ikọ akukọ ha. 3Ihe-iriba-ama-Ya nile, le ka ha si di uku ri nne! ihe-iju-anya-Ya nile kwa, le ka ha si di ike nke-uku! ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile.
4Mu onwem, bú Nebukadneza, nọ n'udo n'ulom, nọ kwa ka osisi nwezuru akwukwọ ndu ya n'ulo ukum. 5Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji. 6N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon bata n'irum, ka ha we me ka m'mara isi nrọ ahu. 7Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya. 8Ma n'ikpe-azu Daniel batara n'irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n'iru ya ka m'zere nrọ ahu, si, 9Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n'ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m'huworo, na isi-ya. 10Ma ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam di otú a: anọm nāhu, ma le, otù osisi n'etiti uwa, idi-elu-ya di kwa uku. 11Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n'elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile. 12Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu. 13Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida. 14Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu. 15Ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu-ọhia n'ihe-ọkukú nke uwa: 16ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n'isi. 17N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya. 18Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n'ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m'mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n'ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi.
19Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi. 20Osisi ahu nke i huru, nke b͕ara ab͕a, nke di ike, nke idi-elu-ya rutere n'elu-igwe, nke apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile; 21nke akwukwọ-ya mara nma, nke nkpuru-ya riri nne, nke ihe-oriri izuru ihe nile di ya; nke n'okpuru ya ka anu ọhia nēbi, nke ọ bu n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nwere ebe-obibi-ha: 22gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa. 23Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya; 24nka bu akukọ-isi-ya, eze, iwu nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ bu kwa, nke ruteworo onye-nwem, bú eze, aru: 25ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya. 26Ma ebe ha siri ka arapu ogwe nkpọrọgwu nke osisi ahu; ala-eze-gi gēguzosiri gi ike, site na mb͕e i gāma na elu-igwe nāchi achi. 27N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi. 28Ihe a nile rutere Nebukadneza, bú eze, aru. 29N'ọgwugwu ọnwa iri na abua, n'elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari. 30Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam? 31Mb͕e eze kpu okwu a n'ọnu, otù olu siri n'elu-igwe da, si, Gi ka anāgwa okwu, Nebukadneza, bú eze, si: Ala-eze apuwo n'aka-gi. 32Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya. 33N'otù oge hour ahu ka okwu a rère n'aru Nebukadneza: ewe si n'ebe madu bi chupu ya, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka ọ nāta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya, rue mb͕e agiri-isi-ya toputara dika ábúbà ugo, mbọ-aka-ya kwa dika mbọ nnunu. 34Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile: 35ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo? 36N'otù mb͕e ahu ka ihe-ọmumam nālaghachikutem; ọzọ, n'ihi ebube nke ala-ezem, ima-nmam na ib͕u-maramaram nālaghachikutem; ọ bu kwa mu ka ndi-ndum-ọdum na ndi-isim nēkpere; ọzọ, n'elu ala-ezem ka emerem ka m'nọzie, ọ bu kwa idi-uku nke kachasi ka atukwasirim. 37Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.

Currently Selected:

DANIEL 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy