EMOS 1
1
1Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.
2Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.
3Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead: 4ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad. 5M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.
6Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom: 7ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile: 8M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.
9Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne: 10ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.
11Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi: 12ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.
13Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara: 14ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku: 15eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.
Currently Selected:
EMOS 1: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.