YouVersion Logo
Search Icon

ESTA 1

1
1O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:) 2na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n'oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze, 3n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya: 4mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete. 5Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n'onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n'ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze; 6ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n'elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me. 7Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n'ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche,) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru. 8Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ. 9Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n'ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere. 10N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs, 11ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n'iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu. 12Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya. 13Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé; 14ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze:) 15Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n'ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n'aka ndi-onozi? 16Memukan we kwue n'iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs. 17N'ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n'anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n'iru ya, ma ọ biaghi. 18Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa. 19Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya. 20Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà. 21Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di: 22o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Currently Selected:

ESTA 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy