Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka. Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi. Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.