Banyere YouVersion

Otu Ihe Si Dị Mkpa

N'ọgbọ ndị gara aga, ohere ndị mmadụ nwere inweta na igụ Akwụkwọ Nsọ dị nnọọ ntakịrị. Taa, ọ dịghịzi otu ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nwere ike inweta ma gụọ Akwụkwọ Nsọ na-eche na ozi Ya abaghị uru maka ndụ ha n'ebị ugbu a. N'otu oge ahụ, e nwere ndị ọzọ kwenyere na e nwere njikọ dị n'etiti Akwụkwọ Nsọ na ahụmahụ ha kwa ụbọchị.

Mgbanwe Ozi

N'ime afọ iri gara aga, ịntanetị ebutela mgbanwe nke na-enye ndị mmadụ ike dị ka ọ dịtụbeghị mbụ. Site n'ikike ime nkekọrịta, inye aka, imepụta, igbasa na ịkparịta ụka, ọ dị mfe ikwupụta ndị anyị bụ na ihe anyị kwenyere na ya nye ndị ụwa.

YouVersion YuuVershionụ

Kemgbe ọ malitere na 1996, nzube Life.Church bụ iduru ndị mmadụ ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ụzọ zuru ezu. N’ime otú ahụ, anyị achọpụtala ụzọ ọhụrụ anyị ga-esi nyere ndị mmadụ aka ijikọ Akwụkwọ Nsọ na ndụ ha na-ebi kwa ụbọchị. Ụzọ gasị anyị si eme ihe agbanweela kemgbe ọtụtụ afọ ka anyị ji teknọlọji gasị na atụmatụ dị iche iche mee ihe. Ma nke bụ́ isi, anyị na-elekwasị anya ná ihe dị mkpa ka anyị na-agbalịsi ike igosi na ịkụziri ndị mmadụ otú Okwu Chineke si metụta onye ọ bụla, n’agbanyeghị ebe ha nọ ná ndụ. YouVersion na-anọchite anya oke ọhụrụ na mbọ gasị Life.Church n'agba. Ọ bụghị naanị na anyị na-ewu ngwaọrụ iji metụta ụwa site na iji teknọlọji ọhụrụ, nke ka mkpa, anyị na-etinye ndị mmadụ ka ha na Chineke n'enwe mmekọrịta gasị ka ha na-achọpụta idi mkpa Akwụkwọ Nsọ nwere maka ndụ ha.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara