Akwụkwọ Nsọ N'ụdi N'ezughị Ezu
Oziọma
Ndi YouVersion kwadoro atụmatụ a eji agụ akwụkwọ nsọ, ka onyere gị aka ịgucha akwụkwọ ozi anọ nke ndi n'eso ụzọ Jesọs Christ dere na mkpụrụ ụbọchị ịrị atọ. Atụmatụ a g'enyere gị aka ịmụta ihe gbasara ndụ na ozi Jesọs Christ n'oge n'teghị anya.
Akwụkwọ ozi nke Ọhụụ na Ọrụ Ọhụụ
Ọgụgụ site na Pauline, Pastoral, na General Epistles adịbeghị nfe. Atụmatụ a, ndị dị na YouVersion chịkọtara ma gosipụta ya, ga - enyere gị aka ịgụ akwụkwọ ozi niile dị na agba ọhụụ. Ma anyị tụgharịrị n'ọtụtụ Ọrụ Ndịozi maka ezigbo ọfụma.
Abụ Ọma
Ọgụgụ́ site na akwụkwọ Abụ Ọma dị ezigbo mma maka mkpali obi na echiche. Mgbe ị n'agabiga ihe isi ike, akwụkwọ Abụ Ọma pụrụ ịkasị gị obi na nye gị agbamume.
Ndị Kọlọsi
Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị mfe ga eduru gị gazuo akwụkwọ Ndị Kọlọsi ma ọ ga-adịkwa mma maka ọmụmụ ihe nye otu onye ma ọ bụ otù.
Jemis
Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị mfe ga eduru gị gazuo akwụkwọ Jemis ma ọ ga-adịkwa mma maka ọmụmụ ihe nye otu onye ma ọ bụ otù.
Ka Anyị Gụkọọ Akwụkwọ Nsọ Ọnụ (Maachị)
Akụkụ nke atọ nke usoro ihe ọgụgụ dị nkebi iri na abụọ, atụmatụ ihe ọgụgụ a n'eduru ọgbakọ gasị ka ha guzuo Akwụkwọ Nsọ ọnụ n'ụbọchị narị atọ na iri isii na ise. Kpọọ ndị ọzọ òkù ka ha soro gị gụọ ihe oge ọbụla ị malitere ọgụgụ otu akụkụ kwa ọnwa. Ihe usoro ọgụgụ a na-adị mma na Baịbụl gasị nwere ọdịyo—gee ha ntị n'ihe n'erughị minit iri abụọ kwa ụbọchị! Kwa nkeji nwere isi akwụkwọ gasị nke Agba Ọhụrụ na Agba Ochie, Abụ Ọma jupụtakwara ebe niile. Akụkụ nke atọ na-egosipụta Akwụkwọ Ọnụọgụgụ, Ilu, Ndị Rom, na Ndị Hibru.
Timọti 1 & 2
Atụmatụ a dị mfe ga-akporo gị ga na Timọti 1 & 2 ma ọ ga-adịkwa ezigbo mma maka ọmụmụ ihe otu onye ma ọ bụ nke otu.
Obi isi ike
Mụta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara atụghi ụjọ na obi isi ike. Atụmatụ ọgụgụ “obi isi ike” na-agba ndị kwere ekwe ume site n'ichetara ha ndị ha bụ n'ime Kraịst ma n'ime alaeze Chineke. Mgbe anyị bụ nke Chineke, anyị di nwere onwe ịbịakwute Ya n'enweghị ogbachi ọbụla. Gụgharịa--ma ọ bụ ikekwe nke mbụ--mmesi obi ike na ọnọdụ gị n'ime ezi na ụlọ Chineke di nchebe.
Rut, Akụkọ Nke Mgbapụta
Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!