Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: purity

I. TIMỌTI 4:12 (IGBOB)

Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.

ABÙ ỌMA 119:9 (IGBOB)

Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.

I. NDI KỌRINT 6:19 (IGBOB)

Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;

I. NDI KỌRINT 6:20 (IGBOB)

n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

NDI FILIPAI 4:8 (IGBOB)

Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.

ABÙ ỌMA 51:10 (IGBOB)

Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

II. NDI KỌRINT 7:1 (IGBOB)

Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.

I. NDI TESALỌNAIKA 4:3 (IGBOB)

N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;

I. NDI TESALỌNAIKA 4:4 (IGBOB)

ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru,

I. NDI KỌRINT 6:18 (IGBOB)

B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.

NDI EFESỌS 5:3 (IGBOB)

Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;

I. NDI TESALỌNAIKA 4:5 (IGBOB)

ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

I. NDI TESALỌNAIKA 4:7 (IGBOB)

N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ.

I. NDI TESALỌNAIKA 4:8 (IGBOB)

Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.

II. TIMỌTI 2:22 (IGBOB)

Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.

ABÙ ỌMA 119:11 (IGBOB)

N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.

NDI ROM 6:23 (IGBOB)

N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

NDI ROM 8:6 (IGBOB)

N'ihi na itukwasi uche n'anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo:

NDI ROM 12:1 (IGBOB)

Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.

NDI ROM 12:2 (IGBOB)

Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

I. NDI KỌRINT 10:13 (IGBOB)

Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

II. NDI KỌRINT 10:5 (IGBOB)

ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;

NDI GALETIA 5:16 (IGBOB)

Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.

NDI GALETIA 5:22 (IGBOB)

Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,

NDI GALETIA 5:23 (IGBOB)

idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.