Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: hope

ABÙ NKE ABÙ 1:1 (IGBOB)

Abù nke abù, nke diri Solomon.

ABÙ NKE ABÙ 1:2 (IGBOB)

Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum: N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.

ABÙ NKE ABÙ 1:3 (IGBOB)

Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma; Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu; N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.

ABÙ NKE ABÙ 1:4 (IGBOB)

Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.

ABÙ NKE ABÙ 1:5 (IGBOB)

Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

ABÙ NKE ABÙ 1:6 (IGBOB)

Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.

ABÙ NKE ABÙ 1:7 (IGBOB)

Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya, Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie: N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi, N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

ABÙ NKE ABÙ 1:8 (IGBOB)

Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom, Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu, Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

ABÙ NKE ABÙ 1:9 (IGBOB)

Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala Fero Ka m'wereworo gi tuara, gi eyìm.

ABÙ NKE ABÙ 1:10 (IGBOB)

Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.

ABÙ NKE ABÙ 1:11 (IGBOB)

Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi, Ya na nkpọchi ọla-ọcha.

ABÙ NKE ABÙ 1:12 (IGBOB)

Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu, Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.

ABÙ NKE ABÙ 1:13 (IGBOB)

Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum, N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

ABÙ NKE ABÙ 1:14 (IGBOB)

Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burum N'ubi-vine nke En-gedi.

ABÙ NKE ABÙ 1:15 (IGBOB)

Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru.

ABÙ NKE ABÙ 1:16 (IGBOB)

Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ: Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.

ABÙ NKE ABÙ 1:17 (IGBOB)

Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar, Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

ABÙ NKE ABÙ 2:1 (IGBOB)

Mu onwem bu rose nke Sheron, Abum urodi nke ndagwurugwu.

ABÙ NKE ABÙ 2:2 (IGBOB)

Dika urodi n'etiti ogwu, Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom.

ABÙ NKE ABÙ 2:3 (IGBOB)

Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia, Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom. Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala, Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.

ABÙ NKE ABÙ 2:4 (IGBOB)

O mere ka m'bata n'ulo manya-vine, Ọkọlọtọ-ya n'elum bu kwa ihu-n'anya.

ABÙ NKE ABÙ 2:5 (IGBOB)

Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike: N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu.

ABÙ NKE ABÙ 2:6 (IGBOB)

Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim, Aka-nri-ya nāb͕akum.

ABÙ NKE ABÙ 2:7 (IGBOB)

Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

ABÙ NKE ABÙ 2:8 (IGBOB)

Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia, Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.