Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: grace

NDI EFESỌS 2:8 (IGBOB)

n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:

II. NDI KỌRINT 12:9 (IGBOB)

Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.

NDI EFESỌS 2:9 (IGBOB)

o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi.

NDI-HIBRU 4:16 (IGBOB)

Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.

NDI EFESỌS 2:10 (IGBOB)

N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.

NDI ROM 3:23 (IGBOB)

n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

I. PITA 5:10 (IGBOB)

Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

NDI ROM 5:8 (IGBOB)

Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

NDI ROM 8:1 (IGBOB)

Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.

NDI ROM 12:3 (IGBOB)

N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.

NDI EFESỌS 2:5 (IGBOB)

ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),

TAITỌS 2:11 (IGBOB)

N'ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa,

TAITỌS 2:12 (IGBOB)

nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a;

NDI EFESỌS 2:4 (IGBOB)

ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,

NDI ROM 3:24 (IGBOB)

anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

II. NDI KỌRINT 12:10 (IGBOB)

N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.

NDI ROM 5:20 (IGBOB)

Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:

NDI EFESỌS 1:7 (IGBOB)

Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di,

NDI EFESỌS 2:7 (IGBOB)

ka Ọ we gosi ihe a n'oge nile gaje ibia, bú àkù nke amara-Ya di uku ri nne, n'obi-ọma n'ebe ayi nọ nime Kraist Jisus:

II. TIMỌTI 1:9 (IGBOB)

Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,

JỌN 1:16 (IGBOB)

N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara.

I. NDI KỌRINT 15:10 (IGBOB)

Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

NDI EFESỌS 2:6 (IGBOB)

me kwa ka ayi so Ya si n'ọnwu bilikọ, me kwa ka ayi so Ya nọdukọ n'ebe di n'elu-igwe, nime Kraist Jisus:

JEMES 4:6 (IGBOB)

Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.

JỌN 1:17 (IGBOB)

N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.