Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: comfort

II. NDI KỌRINT 1:4 (IGBOB)

Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.

II. NDI KỌRINT 1:3 (IGBOB)

Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;

ABÙ ỌMA 23:4 (IGBOB)

Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.

II. NDI KỌRINT 1:5 (IGBOB)

N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist.

AISAIA 41:10 (IGBOB)

atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.

ABÙ ỌMA 94:19 (IGBOB)

Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

MATIU 11:28 (IGBOB)

Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.

MATIU 11:29 (IGBOB)

Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.

JỌN 14:27 (IGBOB)

Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

II. NDI KỌRINT 1:6 (IGBOB)

Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:

II. NDI KỌRINT 1:7 (IGBOB)

olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu.

ABÙ ỌMA 23:1 (IGBOB)

Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.

ABÙ ỌMA 23:3 (IGBOB)

Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.

ABÙ ỌMA 94:18 (IGBOB)

Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.

ABÙ ỌMA 34:18 (IGBOB)

Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

II. NDI TESALỌNAIKA 2:16 (IGBOB)

Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,

ABÙ ỌMA 23:2 (IGBOB)

N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.

ABÙ ỌMA 23:5 (IGBOB)

I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.

ABÙ ỌMA 23:6 (IGBOB)

Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum: M'gēbi kwa n'ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

MATIU 6:25 (IGBOB)

N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?

MATIU 6:33 (IGBOB)

Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

MATIU 6:34 (IGBOB)

Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.

MATIU 7:7 (IGBOB)

Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu:

MATIU 11:30 (IGBOB)

N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.

MATIU 28:20 (IGBOB)

nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.