Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị achọpụta maka ihe

NDI FILIPAI 4:6 (IGBOB)

Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.

NDI FILIPAI 4:7 (IGBOB)

Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.

I. PITA 5:7 (IGBOB)

nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.

MATIU 6:25 (IGBOB)

N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?

MATIU 6:27 (IGBOB)

Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya?

MATIU 6:31 (IGBOB)

Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?

MATIU 6:33 (IGBOB)

Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

MATIU 6:34 (IGBOB)

Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.

ABÙ ỌMA 94:19 (IGBOB)

Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

JOSHUA 1:9 (IGBOB)

Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

JỌN 14:27 (IGBOB)

Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

II. TIMỌTI 1:7 (IGBOB)

N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

ILU 12:25 (IGBOB)

Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

EKLISIASTIS 11:10 (IGBOB)

Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.

LUK 12:25 (IGBOB)

Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya?

EZIKIEL 4:16 (IGBOB)

O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha:

NDI FILIPAI 2:28 (IGBOB)

Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.

I. NDI KỌRINT 7:34 (IGBOB)

Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.

I. PITA 5:6 (IGBOB)

Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;

ILU 12:24 (IGBOB)

Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.

EKLISIASTIS 12:1 (IGBOB)

Cheta kwa Onye kèworo gi n'ubọchi nile i di n'okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ;

ILU 12:26 (IGBOB)

Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.

I. PITA 5:8 (IGBOB)

Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

EKLISIASTIS 11:9 (IGBOB)

Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.

NDI FILIPAI 2:29 (IGBOB)

Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a: