Ngosi ihe ndị achọpụta maka ihe
NDI FILIPAI 4:13 (IGBOB)
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.
II. NDI KỌRINT 12:9 (IGBOB)
Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.
II. NDI KỌRINT 12:10 (IGBOB)
N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
AISAIA 40:29 (IGBOB)
Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.
AISAIA 40:30 (IGBOB)
Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da:
AISAIA 40:31 (IGBOB)
ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.
ABÙ ỌMA 18:1 (IGBOB)
Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.
NDI EFESỌS 6:10 (IGBOB)
Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.
MAK 12:30 (IGBOB)
i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum.
AISAIA 41:10 (IGBOB)
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.
DEUTERONOMI 31:6 (IGBOB)
Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.
ABÙ ỌMA 73:26 (IGBOB)
Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.
I. IHE EMERE 16:11 (IGBOB)
Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
II. SAMUEL 22:33 (IGBOB)
Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm.
ABÙ ỌMA 28:7 (IGBOB)
Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.
NEHEMAIA 8:10 (IGBOB)
O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
ABÙ ỌMA 119:131 (IGBOB)
Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.
NDI EFESỌS 1:19 (IGBOB)
mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di,
ABÙ ỌMA 65:6 (IGBOB)
Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike; Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:
I. NDI KỌRINT 16:13 (IGBOB)
Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.
DANIEL 10:19 (IGBOB)
O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we me onwem ka m'di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n'ihi na i mewo ka m'di ike.
NDI KỌLỌSI 1:29 (IGBOB)
anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.
JEMES 5:16 (IGBOB)
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.
NDI-HIBRU 4:10 (IGBOB)
N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.
NDI-HIBRU 11:34 (IGBOB)
menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.