Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AgụụIhe Nhụchatụ

Agụụ

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Agụụ dịka akara ngosi nke okwukwe anyị

Eji m n’aka na ị nwere ike ịkpọ ndị ị na-atụ anya ka gị na ha nọ̀rịa. Anyị ekwesịghị ibi ndụ naanị anyị. Etu esi mebe anyị bụ ka anyị na ndị ọzọ na-emekọ, maka na emebere anyị n’onyinyo nke Chineke nwere mmekọrịta. Isi ihe Chineke bu n’obi kee anyị bụ mkpakọrịta. Ọ chọrọ ka anyị mara Ya, ka anyị dị ka Ya, ma kpughee ebube Ya nye ụwa. N’ezie, ọdịda ụmụ mmadụ n’ime mmehie mebiri mmekọrịta zuru oke nke Chineke mebere ka anyị na Ya na-enwe, mana Chineke enweelarị atụmatụ o guzobere: Jizọs.

O nwere ike ịbụ na i nwere akụkọ ị ga-akọ banyere ndị enyi maọbụ ndị ezinụlọ gị bụ́ ndị matara Jizọs, bụ́ ndị ndụ ha gbanwere n’ụzọ dị ukuu n’ihi ọchịchọ ha iso Chineke na-anọrị. O nwere ike ịhụtụgo udi ihe a. Mmadụ na Chineke inwe mmekọrịta bụ azịza dị mkpa nke onye na-azọrọ na agụụ ịmatakwu Chineke na-agụ ya. Itinye ya n’ụzọ ọzọ: agụụ anyị na Chineke inwe mmekọrịta - itinye oge n'ekpere, ofufe, na Okwu Ya - bụ isi ihe nke okwukwe anyị. Devid si otú a kwuo ya: ‘Otu ihe ka m na-arịọ n’aka Jehova, naanị nke a ka m na-achọ: ka m wee biri n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ m, ilegide ịma mma Jehova anya na ịchọ Ya. N’ụlọ nsọ Ya.' (Abụ Ọma 27:4)

Mmadụ ọbụla na-enwe agụụ nri maka na ọ na-enye ihe ndi na-enye aka idobe ahu anyi ma meek a o gbasie ike. N’ụzọ ime mmụọ, anyị nwere n’ime anyị agụụ Chineke, afọ na-eju anyị site n’itinye oge dị ukwuu n'ekpere na ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ. Devid biri ndụ kpam kpam maka Chineke. Ọchịchọ nke ịchè naanị maka Chineke mere e ji kọwaa ya ka nwoke na-eso obi Chineke. Chegodu echiche ka ndụ anyị ga-esi metu ụwa ma ọ bụrụ na anyị ebie ndụ n’ụdị ịnụ ọkụ n’obi maka Chineke dịka anyị na-ahụ ná ndụ Devid. Chegodu etú anyị nwere ike isi gbanwee ụwa gbara anyị gburugburu ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-egbu ihe ndọpụ uche ma na-elekwasị anya naanị n’ebe Jizọs nọ.

Luk 10 kọọrọ anyị akụkọ banyere ụmụnne nwaanyị abụọ, Meri na Matà, nabatara Jizọs n’ụlọ ha. Meri nọdụrụ ala n’ụkwụ Jizọs ebe Mata na-arụsi ọrụ ike igbo mkpa anụ ahụ́ Ya. Jizọs kwuru, sị: ‘Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-ewekwa iwe maka ọtụtụ ihe, mana ọ bụ ihe ole na ole ka a chọrọ - maọbụ naanị otu. Meri ahọrọwo ihe ka mma, a gaghịkwa anapụ ya n’aka ya.’ Jizọs adịghị abara Mata mba nke ukwuu n’ihi na ọ kpọrọ ya òkù ịbịa n’ihu Ya. Ọ na-akpọkwa gị. Ka ị mata maka agụụ na-agụsi ike ịmata Chineke nke ọma. Ka a kpalie mmụọ gị iwepụta oge n’ihu Chineke. Ka Ọ gbanwee gị karịa ka Ị wee bụrụ oyiyi Ya, ka agụụ Ya malitekwa ịgụ ndị ọzọ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Agụụ

Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Lawrence Oyor maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.youtube.com/lawrenceoyor