Ọhụrụ n’OkwukweIhe Nhụchatụ

N’efu, Ntọhapụ na Mgbahapụ!
Onyinye nke nzọpụta bụ onyinye efu nke nwere ọnụahịa o ji bịa, nke bụ ndụ nke Ọkpara Chineke. O were Chineke ndụ nwa ya ka iji kwụọ ụgwọ O na-ejighị. Kama ịma ikpe, ọ dị mkpa ka ị hụ etu ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ị nọ si dị omimi, na etú Ọ na-agaghị egbochiri gị ihe ọma ọbụla.
Onye a zọpụtara ga-ebi ndụ ibu nnwere onwe na ntọhapụ ahụ n’obi. Ị bụghịzi onye ị bụbu. Ọ bụrụ na onye ọbụla anọdụ na Kraịst, ọ bụ onye e kere ọhụrụ, ihe ochie niile agabigawo, ihe niile aghọwokwa ihe ọhụrụ. Etu a ka Akwụkwọ Nsọ si kọwaa otu nwoke nabatara Jizọs Kraịst. Ọ na-ekwukwa na ọ dịghị ikpe ọbụla maka ndị bụ nke Jizọs Kraịst.
Ogo nke Chineke gbaghaara gị adabereghị n’etú i chere mmehie gị si ‘dị arọ’ maọbụ ‘mfe’. O wezugawo mmehie gị n’arụ gị, dika ọwuwa-anyanwu si di anya n’Ọdịda-anyanwụ.
A naghị amata gị site na mkpebi na-ezighi ezi ị mere n'oge gara aga. Nabata onye ị bụ ugbu a n'ime Kraịst.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Jizọs Kraịst bịara ịnwụ maka mmehie anyị ka anyị wee nwee ndụ ebighị ebi. Ọ bụ mmụgharị ya n’ime ndụ ọhụrụ. Ya mere, ọ dị mkpa na a ga-agwa onye kwenyere ọhụrụ uru na ọghọm, ihe o nwe na omenala nke ndụ ọhụrụ a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/