Mkpụrụ Obi M, Gọzie JehovaIhe Nhụchatụ

Ike Chineke Na-eme Ka Ihe Dị Ọhụrụ
Ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na ike Chineke abụghị nanị maka ịzọpụta, ịgwọọ, ma ịweghachi, kama na otu ike ahụ na-emekwa ka ihe dị ọhụrụ.
Ọ dịtụla mgbe ị na-enwe mmetụta mkpọchapụ, ike ọgwụgwụ, n'agwụ m ike ? Abụ Ọma 103: 5 na-echetara anyị na Chineke bụ Onye na-eme ka ihe dị ọhụrụ, onye na-eweghachi, na afọ ojuju nke anyị.
Chineke na-eme ka ike anyị, olileanya anyị, na nzube anyị dị ọhụrụ. Ọ na-ewepụ ihe ochie ma nye anyị ihe ọhụrụ. Ọ na-eme ka mkpụrụ obi anyị dị ọhụrụ, na-eme ka obi anyị dịghachi ndụ, ma na-eweghachi agụụ anyị.
Mmeghari ohuru nke Chineke abughi naanị ihe ndozi nke n'adịghị adịgide. Kama ọ bụ mgbanwe miri emi nke na-egbo mkpa anyi ndị miri emi. Ọ na-emeju akpịrị ịkpọ nkụ anyị maka ihe ndụ anyị pụtara, agụụ anyị maka bụ nzube ndụ anyị, na agụụ anyị maka njikọ. Ọ na-eme ka anyị jupụta n'ọnụnọ Ya, udo ya, na ọṅụ Ya, na-eme ka anyị dị mma ọzọ.
Otito dịrị Chineke ruo mgbe ebighị ebi.
Ekpere:
Daalụ Nna maka ike gị nke na-azọpụta, na-agwọ ọrịa, na-eweghachi ma na-emegharị. Nyere m aka icheta mgbe niile ịgbakwutere gị mgbe m na-enwe mmetụta mkpochapụ, ike ọgwụgwụ ma ọ bụ agwụ m ike.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Abụ Ọma 103:1-5. A dụrụ anyị ọdụ ka anyị jiri ihe niile dị n'ime anyị gọzie Onyenwe anyị, ebe anyị maara na ọ na-azọpụta, na-agwọ ọrịa, na-eweghachi ma na-eme ka ndụ anyị dị ọhụrụ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d