Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu AIhe Nhụchatụ

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu A

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ikwu okwu okwukwe

Otu n'ime ihe akaebe kachasị nke ọnụnọ nke okwukwe bụ okwu.

Okwu ndị ị na-ekwu ga-ekpughe ma gosi nkwenye gi n'ezie okwu Chineke, ma ọ bụ naanị nkwenye uche gị.

Ikwupụta Jizọs dị ka Onyenwe anyị bụ ikwupụta nkwenye gi na Ya, ntụkwasị obi gị na ịdị mma Ya, na nnyefe gị n'uche Ya.

Nkwupụta abụghị naanị ihe omume otu oge kama ọ bụ omume ndụ anyị niile. Ọ bụ nkwupụta nke okwukwe gị, nkwupụta nke olileanya gị, na akaebe nke mgbanwe gị.

Mgbe anyị na-ekwupụta Jizọs dị ka Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị okwu ọnụ k'anyị na-ekwu; Anyị na-anabata eziokwu nke na-agbanwe ndụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Obi nke kwere n'ezie na okwu Chineke ga-ekwupụta Jizọs mgbe niile dị ka Onyenwe anyị nye ndị ọzọ site n'ikwusa ozi ọma.

Prayer: Ezi Chineke, Nyere okwu m na omume m aka ịnọgide na-ikwupụta ọrụ gị nke rụchaworo n'obe, ma mee ka ọtụtụ ndị ọzọ kwenye ma bịakwute gị.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu A

Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Ndị Rom 10:6-10: Mmesi obi ike nke ọnụnọ Chineke na-adịgide adịgide mgbe niile, ịdị nso nke okwu Chineke, ya na oku iji kwupụta Jizọs n'ezie site n'ịkpọsa ọrụ nke ya ọ rụchaworo nye ụwa site n'okwu na omume anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d