Nkwa AhụIhe Nhụchatụ

Nkwa Nke Ịdị Oké Mkpa
Jonathan na Michelle alúolá di na nwunye ruo afọ iri ma ọ bụ̀ uche ha na ha dị n'ụdị ha kachasị mma mgbe ha n'eje ozi maka ndị ọzọ ma ha na ndị enyi ha ana enwe obi añụrị ka ha nọ ọdụ gburugburu na tebụl.
Jonathan:
“Unu agaghị enwe chi ọzọ na akụkụ M.”
Nke a dị mfe ime. Adịghị m efe chi ndị okpukpe ọzọ. N'ezie adịghị m efe chi m n'amaghị maka ya nọ n'eluigwe ma ọ bụ soro nkụzi ndị okpukpe ọzọ. Eziokwu. Eji m iwu ahụ kpọrọ ezigbote ihe. Mana kedụ ka nke a sirì gbasa alụmdi na nwunye?
Jìrí ya nwaayọ. Gbalịa gụọ ya otù a, “enwela ihe ọbụla ọzọ ma ọ bụ onye ọbụla ọzọ n'ihu M.” Ihe m ndị m pụrụ itinye n'ịdị mkpa karịa Kraịst: alụmdi na nwunye m, ọrụ m, ụmụ m, ahụike m, na ihe ndị ọzọ. Ihe ndị a niile dị mma. Ruo mgbe ijì ha kpọrọ ihe karịa Chineke. Mgbe ahụ ka ha gà-aghọzi chi. Nke a bụ̀ ihe m ghọtara: mgbe ihe nke ndụ bidorò rawá ahụ, ọ nà-abụkarị n'ihi na etinyela m ihe ma ọ bụ mmadụ n'ebe Chineke kwesịrị ịnọ na ndụ m.
Ejighị ihe ọbụla kpọrọ ihe karịa Kraịst adịghị mfe, mana ọ bụ maka ọdịmma gị. Mgbe ihe ndị iji kpọrọ ihe dị n'usoro ha kwesịrị ịdị—Chineke buté ụzọ, na alụmdi na nwunye gị ana esote—ọ bụghị naanị na agà enwe mmekọrịta mara mma na alụmdi na nwunye gị, kama agà enwekwa udo dị omimi, ahụ iru ala, mmesi-obi-ike nke ime mmụọ n'ime gị ana apụghị ịkwụsị.
Michelle:
Ọtụtụ mgbe, ana m ahụ onwe m ná-aghọtá na m etinyela ihe ndị ọzọ n'ọkwá Chineke na di m kwesịrị ịnọ n'ime ndụ m, n'ihi na edozighi m usoro ihe m dị mkpa! E tinyekwarà m ihe ndị m ji atụrụ́ ndụ n'elu ha!
Ibuté Chineke ụzọ n'ihe niile pụtara gị iji mkpachara anya wepụta oge ka gị na Ya nọkọọ, ịgụ Okwu Ya, ibu ụzọ chọọ ihu Ya karịsịa ihe niile. Ihe niile! Ma ime nke a abụghị naanị m ka ọ gà emetụta. Mgbe usoro ihe m ndị dị m mkpa ezighi ezi, adịghị m enweta ihe ndị m chọrọ, nke na-akpata na mụ ana elekwasị Jonathan anya ka o gbooro m ha. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ana m asị ya wepụ Chineke ma buté m ụzọ. Nke ahụ abụghị ihe dị mma. Naanị Chineke pụrụ imejupụtarà m ihe ndị m chọrọ n'ụzọ zuru ezù. N'ụzọ dị ekele, ana m amụta ma ka n'amụta na alụmdi na nwunye m dị ike naanị ka m si dị ike n'ime Onye-nwe-anyị. Ma iji Chineke kpọrọ ihe karịa ihe niile bụ̀ naanị ụzọ ná-arụpụtá ihe dị mma niile anyị chọrọ!
Kpee Ekpere: Chineke, gịnị bụ̀ ihe ahụ m kacha kpọrọ ihe na ndụ m? Gịnị n'esote ya n'ọkwá ịdị mkpa? Nke atọ abụrụ gịnị? Ị gà ènyé m ike iji wee nwee mkparịta-ụka gasị m kwesịrị inwe na mee mkpebi ndị m kwesịrị ime iji hazie na tinye ihe m ndị m kpọrọ ihe n'usoro ha kwesịrị ịdị? Amen.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'ime Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a ndị Life.Church nyerè, di na nwunye isii n'èdé maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha n'ekwughị mgbe ha guzo n'ihu ebe nchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, nrụkọ-ọrụ, ịdị ọcha na ikpe ekpere bụ̀ nkwa n'eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere ụbọchị agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ̀ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ịna eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ.
More