Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke Bụ̀ _______Ihe Nhụchatụ

God Is _______

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

Chineke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Jizọs Kraịst bụ otu ihe ahụ ụnyahụ na taa na rụọ mgbe ebighị ebi. Ndị Hibru 13:8 NIV

Ọ̀ dịtụla onye tụwọọrọ gị asi, mee gị nraranye, ma ọ bụ mebie ntụkwasị obi gị? Ọ nwere ike ipụta, na ihe ndia emeela n'oge ụfọdụ na ndụ gị, nwekwee ike bụrụ ihe ndi ga-eme ọzọ n'ọdịnihu. Gịnị kpatara nke a? N'ihi na ụmụ mmadụ abụghị ndi zuru oke.

Anyị na-agba mbọ ike anyị niile idebe okwu anyị, imezụ nkwa anyị, ma bụrụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, mana n'oge ụfọdụ, anyị niile ga-adakwa mba n'ime ihe ndi a. Ma ọ bu emezụghi oge anyi kwesiri iji mee ihe n'ọrụ na imebi nkwa anyi kwere enyi anyị, anyị niile ga emeriri ihe ndi ga-eme ka a ghara itụkwasị anyi obi n'mmekọrịta anyị na ndi mmadu.

Ịnweta mmebi ntụkwasị obi na-egbu mgbu nke ukwuu ma mmetụta ya a bụghị naanị ihe na-adi n'obere oge, odikwa n'odinihu. N'ezie, enwere nyọcha sayensị akwara ozi hụpụtara sara mbara banyere mmetụta mmebi ntụkwasị obi na-eme n'ime ụbụrụ anyị, ahụ anyị, na mmekọrịta anyị na ndi mmadu.

E kere ụbụrụ anyị ka ọ na-atụkwasị ndị ọzọ obi, mgbe anyị tụkwasara ndi mmadu obi, ụbụrụ anyị na-emepụta oxytocin, nke ndị ọkà mmụta sayensị kpọrọ "kemikalụ nke ịhụnanya" ma ọ bụ "ọgwụ nke agwọkọrọ agwọkọ nke ntụkwasị obi." Mmepụta nke kemịkalụ a n'ime ụbụrụ anyị na-eme ka anyị nwekwụọ ntụkwasị obi, ya mere na ka anyị n'enwekwụ ahụmịhe banyere ntụkwasị obi nke di nma, ka anyị na-adịkwu njikere ịtụkwasị ndị ọzọ obi.

Ihe dị iche na ya bụkwa eziokwu, agbanyeghị. Mgbe mmadụ mebiri ntụkwasị obi anyị, ọ na-akpali akụkụ ụbụrụ anyi nke na-emepụta egwu, nke na-eme ka ọ sịkwụọ ike inwe ntụkwasị obi n'ihe ma ọbụ n'mmadu n'ọdịnihu.

Ya mere, a bịa n’ịtụkwasị Chineke obi, anyi n'enwekari ọnwụnwa na-eme ka anyị buru ahụmahụ ndi gara aga nke anyi na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere wụsa ha na ahụmahụ ugbu a nke di n'etiti anyị na Chineke zuru okè.

Eleghị anya, ọ na-esiri gị ike ịtụkwasị Chineke obi n’ihi na nne gi ma ọ bụ nna gi ma ọ bụ onye ọchịchị emeele gi ihe mwụte. Ma ọ bụ ikekwe ọ na-esiri gị ike ịtụkwasị Chineke obi n’ihi na ihe jọgburu onwe ya mere ná ndụ gị, ọ dịkwa gi ka Chineke azaghị ekpere gị ka ihe ọjọọ ahu kwụsị.

Ma ọ bụ ezie na ihe mgbu nke ahụmahụ ndị a dị adị, ọ dịghị agbanwe eziokwu banyere onye Chineke bụ. Ọ bụ naanị Ya bụ Onye a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam. Ka anyị leba anya n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị gbasara ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Chineke obi:

  • Ọ dịghị mgbe Ọ na agbanwe agbanwe. Ọ dighi ka umu mmadu, ndi nwere ike igbanwe obi ha mgbe ọbụla ha jiri chọọ, Chineke enwekataghi gbanwee obi Ya banyere ịhụnanya Ọ nwere n'ebe ino ma ọbụ n'ebe atụmatụ ndi Ya di nma gbasara gi. Ọ dịghị agbanwe agbanwe, makwa ịhụnanya Ya na-adigidekwa. (Gụọ Malakaị 3:6 and Ndi Hibru 13:8.)
  • Ọ nweghị mgbe Ọ ji ahapụ anyi ma ọbụ gbahapụ anyi. Ọ nweghị ihe ọbụla iga eme ga-eme ka Chineke nwekata gbaa gi azu. Ọnụnọ Ya nọnyeere anyi mgbe niile, n'agbanyeghị ihe ọ bụla ga-eme anyị, Ọ ga-anọnyere anyị n'ime ihe ndi ahu niile. (Gụọ Ndi Hibru 13:5 Ndi Rọm 8:39.)
  • Ọ na-arụ ọrụ mgbe niile maka ọdịmma anyị. Ọbụnadi mgbe anyi n'enwe ahụmahụ mgbu na ndụ a, Chineke pụrụ ike ihe mara nma site n'ntụ nke ihe mebisiri emebi. Ọ pụrụ iche na iweghachita na igbapụta, makwa Ọ pụrụ inye ihe mgbu anyị nzube. (Gụọ Ndi Rọm 8:28, Aịzaya 61:1-3.)

Agbanyeghi ụgbọrọ ole na ole ndi mmadu kpụrụ olileanya gi n'ala, Chineke enwekataghi mee nke ahu. Ọ nwekataghi hapụ gi, makwa Ọ kwesiri ntụkwasị obi gi.

Kpee ekpere: Chineke, ọ nwere ike ina-esiri m ike mgbe ụfọdụ ịtụkwasị Gị obi n'ihi na _________. Ị ga-enyere m aka imeri ihe mgbochi ahụ ma tụkwasị Gị obi kpam kpam? Daalụ maka ịbụ Onye ekwesiri itụkwasị obi n'uju. Gaa n'ihu na-ewụlite okwukwe m na ntụkwasị obi n'Ọnye Ị bụ, ana m ekelekwa Gị maka ịrụ ọrụ n'ime ihe niile iji webata ọdịmma Gị. N’aha Jizọs, amen.

Ihe ịma aka: Wepụta oge kpee ekpere banyere ma nwee nmata mpaghara ọbụla na ndụ gị ebe ị na-adighi atụkwasị Chineke obi n'uju. Mgbe ị mere nke ahụ, nyefee Ya ihe ndị ahụ n'aka. Ị nwedịrị ike dee ha ma tinye ha n'ime ihe nwere mkwụchi iji gọsi na ị na-enyefe ha n'aka Chineke.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God Is _______

Ònyé ka Chineke bụ̀? Anyị niile nwerè azịza dị iche iche, mana olee otu anyị gà-esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwerè ebe Chineke nọ, gị na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gị na ndị ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—Chi dị irè, dị adị, na dị njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị isii n'eso usoro ozizi Ụkọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke Bụ̀ _______.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/