Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Kpatara Ejiri Mụọ JizọsIhe Nhụchatụ

Why Jesus Was Born

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Nye Unu

N'ihi na nye unu ka a mụrụ n'ụbọchị a. . . Onye nzoputa. (Luk 2:11)

Afọ iri atọ gara aga nke ọnwa a ka amụrụ nwa anyị nwaanyị. Anọ m na-arụ ọrụ pastọ ma n'ihi na ọmụmụ ahụ mere n'isi isi ụtụtụ nke ụbọchị Sonde, onye ụkọchukwu lara ezumike nká bịara nọchie m ikwusa ozi ọma. Na mbido ụka ahụ, a mara ọkwa sí: “Ụkọchukwu Hoezee na Rosemary mụrụ nwa nwanyị n’ụtụtụ a.” Ma ọ́ gaghị abụ ihe pụrụ ịgba uche gharii ma ọ bụrụ na o kwuru si, "Ụtụtụ a, a mụrụ nwa nye unu"? Nwa anyị nwaanyị bụ nke nwunye m mụrụ nye anyị. Ọ bụghị nwa amụrụ “nye” ọha ụka anyị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ.

Mana okwu a bụ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ ezigbo ụjọ jiderè: A mụwó Onye Nzọpụta “nye” unu. Mana olee otú nke ahụ si bụrụ ihe dabara adaba ma e chee ya n'echiche? Nwa ahụ a mụrụ bụ̀ nke Meri na nke Josef kwa (n'agbanyeghị na ọbụbụ ha dịka nne na nna ya adịghị ka nke ụmụ ndị ọzọ). Mana nwa ahụ a mụrụ abụghị nke ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ. Ha agaghị agbanwe uwe nsi na mmamiri ya. Ha agaghị enye nwa ahụ nri ma ọ bụ zụlite ya. Ha ga-abịa leta nwa ahụ ma laghachi na ụmụ atụrụ ha n'azụ.

Mana Jizọs abụghị nwa nkịtị. Ọ bịara maka mmadụ niile. A mụrụ Ya nye anyị niile. Ọ bụghị nwa nke ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ, mana Ọ bụụrụ ha Onye Nzọpụta. Ọ bịara maka ha, ha bụ ndị e ledara anya, ndị a kpọrọ asị, na ndị ana-adịghị eleta ọbụna na ha so bụrụ ndị a gụnyere a mụrụ Jizọs “nye." Okwu ndị ahụ bụ́ "Nye Unu” bụ̀ ndị anyị na-agafekari atụnyeghị uche na ha. Mana ha bù isi ihe nke Ozi Ọma!

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Why Jesus Was Born

Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Words of Hope maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://woh.org/youversion