Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Ka anyị kpee ekpere:
Nna anyị nke bi n'elu-igwe, anyị n'ekele Gị maka oke aṅụrị nke Ekeresimesi.
Ọbịbịa nke Ọkpara Gị, maka anyị na maka nzọpụta anyị, bụ n’ezie ihe na-eweta ọṅụ dị ukwuu—mana Ya Onwe Ya bụ ọṅụ kachasị ọṅụ niile.
Nna, kpalie n'ime anyị n’oge Amụma Ọkwa Ọbịbịa a, ọn̄ụ n’ime Kraịst nke na-etowanye ma n'aza ma n'adikwu omimi zuru oke iji dié ọtụtụ ọnwụnwa na ahụhụ ndị anyị na-eche ihu n’oge a.
N’aha Jizọs ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.
More