Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 24 NKE 25

Abalị Dị Jụụ

Ebube kwa ebube si n'eluigwe dị anya n'awudatá. Ìgwè nke eluigwe n'agụ Haleluya!
A mụọla Kraịst Onye-Nzọpụta! A mụọla Kraịst Onye-Nzọpụta!


Mgbe m bụ nwata, anyị dara ogbenye. Anyị anaghị azụta ihe ọ bụla ọzọ karịa ihe ndị dị mkpa n'ime afọ. Ihe dị ka ọnwa abụọ tupu Ekeresimesi, ndị mụrụ m gwara m ka m depụta ihe niile m chọrọ. E nyochara m katalọgụ gasị, gaa n'ụlọ ahịa gasị (nke a bụ tupu enwee ịntanetị na ị chọgharị ihe na saibá kafe), na roo nrọ banyere ihe niile m nwere ike iji tuo ndụ mmanụ n'afọ na-abịa. Mgbe m mechara ndepụta m, ejiri m obi ezuu-okè wee na-atụ anya onyinye ndị ga-anọ n'okpuru osisi Ekeresimesi anyị. Nchere ahụ dị m ka afọ, mana eriri m uru ya. Ụtụtụ Ekeresimesi bụ m ụbọchị kachasị mma! N'afọ ahụ niile eji m ihe egwuregwu ụmụaka niile ọhụrụ m nwetara wee n'enwe ezigbo obi ụtọ!

Ụmụ Chineke, ruo ọtụtụ narị afọ, echerewo ọbịbịa nke Onye-Nzọpụta ha. Nne na nna gwara ụmụ ha gbasara Eze na-abịa: Onye ga-azọpụta ha niile. Ụmụ ha gwara ụmụ ha. Onye ọ bụla nọ na-eche Onye ahụ ha nụrụ banyere ya. Ọbịbịa Jizọs, Onye Nzọpụta ha, bụ abalị dị nsọ. Eluigwe ṅụrịrị ọṅụ. Ndị mmụọ ozi bụrụ̀ abụ. Ndị ọzụzụ-atụrụ mara jijiji n'ihi ihe ha hụrụ. N'oge Ekeresimesi, anyị na-echeta ụbọchị a eluigwe bịara n'ụwa! Ụbọchị Chineke mezuru nkwa Ya! Ụbọchị Chineke ghọrọ mmadụ iji gbapụta ụmụ Ya n'ụwa tiwara etiwa. Onye-Nzọpụta gị nọ ebe a. N'akụkụ gị! Ị kwesịghị ịdị n'atụ anya ihe ị nwere. Ṅụrịa ọṅụ. Nwee obi ụtọ na onyinye e nyere gị!

Ajụjụ:

N’akụkụ ndị dị aṅaa nke ndụ gị ka ị n'eche ma n'atụ anya ka Chineke gosipụta Onwe-Ya?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church