Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Nwatakịrị Nwoke Ahụ N'akú Ịgbà
Bịa, ka ha gwara m, Pa rum pa pum pum
Bịa hụritá Eze amụrụ ọhụrụ, Pa rum pa pum pum
Abalị ahụ dị jụụ, naanị kpịm kpịm obi ya ka ana n'anụ. Otití obi ya dịka ọ n'adachi naanị ya ntị, ya ana agba onwe ya ajụjụ ma ndị ya na ha so eme njem ha na-aṅụkwa ụda a obi ya n'asụ̀. Obi nọ n'ama ya jijiji n'ihi na o nwere Eze ọ n'aga ihu, mana o jidesiri onwe ya ike wee n'eje yabụ ije, pasie ịgbà ya ike.
Obi ya nọ n'akú kpịm kpịm chọọ ikupụ n'obi ya. Ndị ya na ha so eme njem bucha igbe mara mma jupụtara n’onyinye dị oké ọnụ ahịa, onyinye ndị kwesịrị Eze. Ọ dịghị ihe ọbụla o nwere inye abụghị ịgbà ya, nke yiri ka o rughị eru ma ọ bụ bụrụ ngwá-egwú kwesịrị ekwesị i kụụrụ́ Eze, ma ọ fọ́ Eze a mụrụ ọhụrụ. A si nnọọ na o nwere ngwá-egwú n'eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, dị ka ụbọ-akwara ụmụ okorobịa ndị n'azụ atụrụ n'akpọ mgbe ụfọdụ, nke ahụ gara imagbu onwe ya.
Ọkụkụ́ obi ya dịka ọ chọrọ igbawa mmadụ ntị ka o guzoro n’ihu Eze. Mana ka nke a n'eme, Meri lere ya anya wee kwee n'isi. Nne Eze lere ya anya wee kwee isi nke nnabata. Ọ chọrọ n'ezie ka ọ kụọ ịgbà ya. Nwatakịrị nwoke a n'eti ịgbà weliri osisi-egwú ya wee malite iku ụda ndị mbụ batara n'isi ya, ụda na otiti nke obi ya na-akụ.
Ya mere Nwatakịrị nwoke ahụ n'eti Ịgbà nyefere Chineke obi ya. O tiri ịgbà ya n'ụzọ kacha mma o si nwee ike iti ya. O nyere ihe kacha mma o nwere ike inye.
Ugboro ole ka ọ na-adị anyị ka onyinye anyị erughị eru ma ọ bụ dị mma? Anyị na-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, n'echè ihe mere onyinye ha ji yie ka ha kasị “baa uru” maka Alaeze Chineke, karịa nke anyị. Anyị chọrọ ịkụzi ihe dị ka Pastọ anyị, ma ọ bụ gụọ egwú dị ka onye-ndú òfùfè anyị. Ma ọ bụ ikekwe anyị chọrọ ịkesara ndị mmadụ ngọzi anyị, mana mgbe ụfọdụ, ọ na-adị anyị ka ngọzi anyị ejughị eju iji mee otú a. Anyị apụghị inye ihe anyị n'enweghị, mana kama ịna atamụ maka enweghị enwe anyị, anyị kwesịrị ịchọ “ịgbà” anyị, otu ihe ahụ naanị anyị pụrụ inye.
Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke enweelarị ozizi dị ka nke Pastọ anyị. O nweelarị ịbụ abụ na ịgụ egwú dị ka nke onye-ndú òfùfè anyị. Ihe Ọ chọrọ, ihe O nwere ike iji n'ezie mee ihe, bụ obi gị.
Chee echiche otú ị ga-esi gọzie ndị ọzọ n'oge a, gọziekwa Chineke. Ọ bụghị iwu na ịga emefu ego. Ọ bụ naanị ihe onwe gị ka ịga enye, nke obi gị. Dịka Nwatakịrị Nwoke Ahụ N'akụ́ Ịgbà mere. Jizọs gosiri ya ihu ọchị. Were anya uche gị hụ ka Jizọs na amụmụ gị ihu ọchị. Nke ahụ n'eme ka obi gị kụọ kpịm kpịm, ọ bụghị ya? Gee obi gị ntị. 😊
Ajụjụ Gasị:
Olee ka ị ga-esi gọzie Chineke site n'ịgọzi ndị ọzọ n'oge ezumike a?
Ị̀ n'enyè Chineke ihe gị kachasị mma na n'ụzọ kachasị mma ị pụrụ inye ya? Ọ bụrụ ị dịghị eme otu a, kedụ ka ị ga-esi malite inye Ya ihe n'ụzọ a ụbọchị taa?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church