Iru Újú N'Ènyé Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge EzumikeIhe Nhụchatụ

Ahh, oge ezumike! Oge mgbe ọdịda akwụkwọ osisi mara mma na-echetara anyị na Mmemme Ekele na-abia n'ihu na atụmanya Ekeresimesi dịkwa nso. Oge mgbe onye ọ bụla jupụtara n'ekele, ịhụnanya, nkwekọ ezinụlọ, na ọñụ, ọbụghị eziokwu?
N’ụzọ dị mwute, nke a abụghị nke onye ọ bụla n'ahu—karịsịa ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ, ndị na-enwe nkụda mmụọ nke mmekọrịta dị ha oke mkpa funahụrụ ha ma ọ bụ na-enwe esemokwu ezinụlọ, ma ọ bụ ndị nnukwu ihe funahụrụ ma ọ bụ ndị na-agabiga obi mgbawa.
Mgbe m na-etolite, oge ezumike bụ nke n'atọ mụ ụtọ n'obi ma mụ ana-atụsi ha anya ike nke ukwuu.
Mgbe nwanne m nwanyị dị afọ 22 nwụrụ n'ụbọchị Mmemme Ekele, kama oge ezumike ịbụ oge kachasị mma n'afọ, oge ezumike ghọrọ oge a na-atụ ụjọ na nke siri ike nke afọ.
Kedu ka ị ga-esi enweta olile anya n'oge ezumike?
Kedu ka ị ga-esi sọpụrụ ndị ị hụrụ n'anya bụ ndị ha na Chineke n'aṅụrị ugbu a n'oge ezumike a n'Eluigwe?
Ọñụ ọ bụ ihe ga-ekwe onwunwe n'oge ezumike...karịsịa n'etiti oke iru uju?
Kedụ ka ị ga-esi mepụta oge ezumike bara uru nke jupụtara na udo, agbanyeghị ihe na-eme na ndụ?
Biko sonyere m ụbọchị ole na ole sochirinụ ka m na-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ.
"Nna Nke Elu-Igwe,
Ana m ekpe ekpere maka ndị niile na-agabiga ihe mwute n'oge ezumike—karịsịa n'oge Mmemme Ekele a na oge Ekeresimesi a. Biko gwọọ ma kasie n'ụzọ dị omimi obi ha na-agabiga ihe mwute. Biko wụsa ha amara na ebere Gị ka mmiri kwa ụbọchị. Jide ha n'aka ịhụnanya Gị ma buru ha gafee ahụmahụ nke iru uju ha. N'Aha Jizọs, amen!"
Ihe Ofufe a © 2015 bụ nke Kim Niles/Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi. Ikike niile iji ya mee ihe di n'aka onye mere ya. A natara ikike iji ya mee ihe.
Igodo: ụbọchị_otu
ụbọchị_otu.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị nà-eme mgbe oge ezumike adighị abụ́ nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a pụrụ iche ewepụtarà maka ogụgụ gà-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otú esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru újú.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kim Niles, bụ́ onye dere Ịnweghachità Ume Gị Ọzọ Mgbe Ndụ Kụwapụtarà Gị Ya, maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na:
www.griefbites.com