Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Inweghachita Ọñụ GịIhe Nhụchatụ

Recovering Your Joy

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Nrubeisi Bụ Ihe Nzuzo Nke Iji Nweta Ọṅụ

Gụọ Abụ Ákwá 3:40.

Añụrị bụ ihe dị mfe ịfunahụ, mana ọ bụkwa ihe dị mfe ịnweghachita. Mgbe i kwetachara na ị funahụrụ ọṅụ gị, i kwesịrị inyocha ihe kpatara ya. Ị ga-eleba anya na ndụ gị wee jụọ onwe gị, “Olee otú m si funahụ ọṅụ m? Gịnị na-anapụ m ọṅụ m?”

Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ọtụtụ oge n'ime Ya ka anyị nyochaa ndụ anyị. Abụ Ákwá 3:40 kwuru sị: “Ka anyị nwalee ma nyochaa ụzọ anyị. Ka anyị laghachikwuru Onye-nwe-anyị.” (NLT).

Enwere ọtụtụ narị ihe ndi na-egbu ọṅụ na ndụ, mana ihe abụọ nke m na-ahụkarị na ndụ ndị mmadụ bụ usoro iji mee ihe ana-akwazighi akwazi na nkà ana-ejighị eme ihe ọbụla. Ị kwesịrị inwe nguzozi n'etiti ezumike na ọrụ, ntinye na mmepụta. Nakwa ị ga-eji nkà gị pụrụ iche ruo ọrụ, nke Chineke nyere gị, ma ọ bụghi otu a ị ga-enwe nkụda mmụọ. Were pasenti ọ bụla nke nkà gị nke a na-adịghị eji aru ọru n'ulo ọrụ gị jiri ya na-eje ozi nke Chineke. Ọ bụrụ na ị nọ n'ọrụ na-eji ihe na-erughị pasenti 25 nke nkà gị, si ebe ahu pụọ.

Ozugbo ị chọpụtara otú ịsi funahụ ọṅụ gị, i kwesịrị imezi ihe na-ezighị ezi.

Ị ma ihe ga-anapụ gị ọṅụ ọsọ ọsọ karịa ihe ọ bụla ọzọ? Mgbe ị maara ihe ziri ezi i kwesịrị ime ma ị meghi ya.

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jems 4:17 sị: “Ọ bụ mmehie ịmara ihe i kwesịrị ime ma ghara ime ya.”

Ya mere ka m jụọ gị: Kedu ihe ị maara na ọ dị mkpa ka ị na-eme ma ị dighị eme ya? Gịnị ka Chineke gwara gị ka ị mee ma ị malitebeghị ime ya?

Ihe nzuzo nke iga n'ihu, iba ụba, na ọṅụ na-ejubiga ókè bụ nrubeisi. Ọ bu ime ihe Chineke gwara gị ka ị mee. Mgbe ọ bụla ị mere ihe Chineke gwara gị ka ị mee, ndụ gị ga-ejupụta n'ọṅụ.

Ị ga-enwekwa ọṅụ mgbe ị na-eche banyere ihe dị mma na ndụ gị. Devid kwuru n’Abụ Ọma 126:3 sị: “Onye-nwe-anyi emewooro anyị ihe ukwu, anyị jupụtakwara n’ọṅụ.” (NIV). Ka ị na-elekwasị anya n'ihe Chineke mewooro gị, otú ahụ ka ị ga-enwekwu ọṅụ ná ndụ gị. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi na ọ na-emepụta ekele. Nakwa àgwà nke ekele bụ mmetụta nke mmadụ kacha nye ahụike.

Ọ bụrụ na ịchọrọ ị nweghachita ọṅụ gị, buru ụzọ kweta na ọ pụwo, wee nyochaa ihe kpatara ya. Mgbe ị mere nke a, dozie ihe na-adịghị mma, ma nweta àgwà nke ekele. Echi anyị ga-ekwu maka usoro atọ ikpeazụ iji nweghachita ọṅụ gị.
Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recovering Your Joy

Ọ bụrụ na ịchọrọ ọñụ na ndụ gị, ị ga-achọta nguzozi n'usoro ihe omume gị. Ụkọchukwu Rick na-ekerịta otu ị ga-esi hazigharịa ntinye gị na mmepụta gị ka nye na nnara gị nyere gị aka nweghachita ọñụ gị, na-abụghị ka ọ funarị gị.

More

Ihe mmụta ofufe a nke e mere na 2014 sitere n'aka Rick Warren. Ikike niile banyere ihe ọbụla eji ihe mmụta ofufe a eme di n'aka Rick Warren. A natakwara ikike iji ihe mmụta ofufe a mee ihe.