Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Nhụchatụ

Waiting Here for You, An Advent Journey of Hope

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Ònyé Ka M Ga-atụ Egwù?

NTỤGHARỊ UCHE

N'etiti nsogbu na oke iwe, lekwasị Jizọs anya. Ọ na-alụrụ gị ọgụ̀. Immanuel nọ gị nso. N'agbanyeghị ebubo n'efegharị iji megide gị na nrụgide nke ndị iro n'echiche gị, n'agbanyeghị na ndị mmadụ na-agbalị igbutu gị na kpụọ aha gị na apịtị, n'agbanyeghị na emere atụmatụ ọjọọ ká nkụ imegide gị na ọnwụnwa ana-achọ ilomi gị ebe ọbụla i chere ihu, n'agbanyeghị na anụ ahụ gị dara mbà gị e wee n'etiku ka ị mee mmegwara—olileanya gị dị n'ebe Onye na-alụrụ gị ọgụ nọ. Ị dị nchebe n'ime ịhụnanya Chineke na n'ime ike nke aha Ya dị ike.

NTỤGHARỊ NKE IME OBI

Atụla Egwù Ịtụkwasị M Obi N'ime Oké Ifufe

Atụla egwù ịtụkwasị M obi n'ime oké ifufe,
Anọ M nso mgbe niile.

A na M abịa ikwụsị egwù gị niile,
Ya mere, ndị M ike gwụrụ, egwù atụla unu.

Gụgharịa Nke A

Atụla egwù, anọnyeere M gị,
Atụla egwù, anọnyeere M gị,
Atụla egwù, anọnyeere M gị,< br />Anọnyeere M gị ụzọ niile.

O nwere ike ya adị gị ka anọghị M nso mgbe niile
Dị ka ị ga-achọ ka M dị;
Mana na jụụ na n'ime oké ifufe,
M na-ahụ ihe ize ndụ niile n'agba gị mgba.

Gụgharịa Nke A

Atụla egwù ịtụkwasị ogwe-aka M dị ike obi;
Ọ bụ Ya budatara nzọpụta.
A tara M oké ahụhụ iji wee nye gị ndụ,
Iji wee nye gị okpueze.

Mee Ngụgharị

J.W. Howe, Stanza 1–3

EKPERE

Nna m, n’etiti oké ifufe, ana m etinye olileanya m n’ebe Ị nọ. Ị na-alụrụ m ọgụ, Gị dị ukwuu karịa ndị iro m niile. Ọ dịghị ihe m n'eche ihu taa dị ike karịa Gị. Ị bụ ala siri ike m gbadorò ụkwụ. Daalụ maka ịgba ndị gbara m gburugburu, gburugburu. Nye m udo n'iru ndị-iro m, ebe m maara na Ị na-ahụ m wee jiri ịhụnanya Gị n'ekpuchi m. Amen.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Waiting Here for You, An Advent Journey of Hope

Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!

More

Anyị ga-achọ ikele Louie Giglio, onye dere N'echere Gị Ebe A (Ụlọ Mbipụta Passion), maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Màkà ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.passionresources.com