Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ BụlaIhe Nhụchatụ

God's Word For Every Need

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

EZI NJIRIMARA ANYỊ

“Unu ga-abụrụ M ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.”

Ezigbo nna ọ bụla nwere ebumnuche mara mma maka ụmụ ya. N'ihe òfùfè nke anyị gụchara, anyị hụrụ akụkụ nke ebumnuche Chineke maka anyị: "M ga-abụ Nna nye gị." Nke ahụ bụ atumatu Ya kemgbe tupu ntọ-ala nke ụwa. Mana e nwere ihe ndị ọzọ sonyerekwa. Ọ bụghị naanị na Chineke chọrọ ka anyị mata Onye Ọ Bụ n'eziokwu; Ọ chọkwara ka anyị mata onye anyị bụ n’ezie. Ọ bụrụ na Ọ bụ Nna anyị, gịnịzi ka a ga-akpọ anyị? Ọ bụrụ na anyị ahọrọ iso Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, nke ahụ na-eme anyị ụmụ Ya ndị ikom na ndị inyom. Nke a bụ ihe ọṅụ kasị ukwuu nke mmadụ nile—ịmata na Chineke bụ Nna ahụ̀ anyị nile nọ n'echere, na inwe obi sie ike n’ime ọnọdụ magburu onwe ya nke ịbụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị Ya ndị esi n'ezi dobata. Nke a bụ ebumnuche Ya maka ndụ anyị. Ka anyị mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru-ọsọ anyị kachasị elu ịbanye n'uju nke ihe ọ pụtara ịbụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nke Nna kachasị ukwuu. Ka anyị mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru-ọsọ ndụ anyị ịbụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị kachasị mma nke anyị nwere ike ịbụ nye Nna anyị nke Eluigwe. Nke a bụ ebumnuche Nna Anyị bi n'eluigwe maka ndụ anyị. Ka anyị meekwa ya ebumnuche nke ndụ anyị!

EKPERE

Ezigbo Nna m, a na m ekele Gị na ị kpọrọ m ka m bụrụ nwa Gị i si n'ezi wee dobata n'obi Gị. Nyere m aka iwulite ihe e jiri mara m na ùgwù a magburu onwe ya. N'aha Jizọs. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God's Word For Every Need

Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị Destiny Image Publishers maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.destinyimage.com