Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 8:12-30 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI ROM 8:12-30 IGBOB (Bible Nso)

Ya mere otú a, umu-nnam, ayi bu ndi ji ugwọ̀, ọ bughi anu-aru ka ayi ji, idi ndu dika anu-aru si chọ: n'ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu. N'ihi na ka ha ra, bú ndi Mọ Chineke nēdú, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke. N'ihi na unu anataghi mọ nke ibu-orù ilaghachi n'egwù ọzọ; kama unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna. Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke: ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto. N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi. N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya? Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike. Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ; ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ. Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.

NDI ROM 8:12-30 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ. Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke. Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị. Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka? Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka. Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.