Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị Rom 8:12-30

Ndị Rom 8:12-30 BIU

Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ. Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke. Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị. Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka? Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka. Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.