Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 95:1-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ ỌMA 95:1-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo ONYENWE ANYị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.

ABÙ ỌMA 95:1-3 IGBOB (Bible Nso)

Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù: Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike. Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike. N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.