ABÙ ỌMA 77:10-12 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 77:10-12 IGBOB (Bible Nso)
M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu. M'gēhota omume nile nke Ja; N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie. M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile, Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.
Kesaa
ABÙ ỌMA 77 IGBOBABÙ ỌMA 77:10-12 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya. Aga m echeta ọrụ niile ONYENWE ANYị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga. Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
Kesaa
ABÙ ỌMA 77 BIU