ABÙ ỌMA 33:20-22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 33:20-22 IGBOB (Bible Nso)
Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu. N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi. Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi.
Kesaa
ABÙ ỌMA 33 IGBOBABÙ ỌMA 33:20-22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị ji olileanya eche ONYENWE ANYị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.
Kesaa
ABÙ ỌMA 33 BIU