ABÙ ỌMA 18:1-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 18:1-3 IGBOB (Bible Nso)
Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem. Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
Kesaa
ABÙ ỌMA 18 IGBOBABÙ ỌMA 18:1-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O ONYENWE ANYị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. ONYENWE ANYị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. Akpọkuru m ONYENWE ANYị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
Kesaa
ABÙ ỌMA 18 BIU