ABÙ ỌMA 142:3-6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 142:3-6 IGBOB (Bible Nso)
Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu. Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim. Etikurum I, Jehova; Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm, Na òkèm n'ala ndi di ndu. Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli: Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.
ABÙ ỌMA 142:3-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya. Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi. Ana m etiku gị mkpu akwa, o ONYENWE ANYị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.” Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.