Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 142:3-6

ABÙ ỌMA 142:3-6 IGBOB

Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu. Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim. Etikurum I, Jehova; Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm, Na òkèm n'ala ndi di ndu. Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli: Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.