ILU 2:6-11
ILU 2:6-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
ILU 2:6-11 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa: O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere; Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ; Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi