Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
Gụọ Ilu 2
Geere nke a ntị Ilu 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 2:6-11
5 Ụbọchị
Ihe ọmụmụ gbadoro ukwu n'ihe gbasara ihe nrite nke ị ga-ije n'amamihe. Iweta amamiihe nke na arụ ọrụ bụ ihe nzuzo nke ibi ndụ gaara nke ọma ma mezuo kwa akaraka.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị