MATIU 4:16-18 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 4:16-18 IGBOB (Bible Nso)
Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiri Huru oké ìhè, Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu, Ndia ka ìhè walitere. Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.
Kesaa
MATIU 4 IGBOBMATIU 4:16-18 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.” Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
Kesaa
MATIU 4 BIU