Matiu 4:16-18
Matiu 4:16-18 BIU
ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.” Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.


