LEVITIKỌS 25:17-19 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
LEVITIKỌS 25:17-19 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu. “ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ. Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo.
Kesaa
LEVITIKỌS 25 BIULEVITIKỌS 25:17-19 IGBOB (Bible Nso)
Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi. Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi. Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.
Kesaa
LEVITIKỌS 25 IGBOB