LEVITIKỌS 25:17-19
LEVITIKỌS 25:17-19 IGBOB
Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi. Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi. Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.

