LEVITIKỌS 10:1-3
LEVITIKỌS 10:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu. Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova. Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.
LEVITIKỌS 10:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu ONYENWE ANYị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu. Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu ONYENWE ANYị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.