Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 10:1-3

LEVITIKỌS 10:1-3 IGBOB

Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu. Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova. Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.