JOSHUA 23:8-11
JOSHUA 23:8-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kama raparanụ nʼahụ ONYENWE ANYị Chineke unu dịka unu mere ruo taa. “ONYENWE ANYị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa. Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ ONYENWE ANYị Chineke unu nʼanya.
JOSHUA 23:8-11 Bible Nso (IGBOB)
kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta. Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta. Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu. Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.