Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 8:20-22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 8:20-22 IGBOB (Bible Nso)

Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè, Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ. Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi, Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi. Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.

JOB 8:20-22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume. Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta. Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”