JOB 8:20-22
JOB 8:20-22 IGBOB
Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè, Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ. Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi, Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi. Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.

