Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 2:10-13

ABÙ NKE ABÙ 2:10-13 IGBOB

Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim, Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo; Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi; Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.