Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 2:10-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ NKE ABÙ 2:10-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m. Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

ABÙ NKE ABÙ 2:10-13 IGBOB (Bible Nso)

Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim, Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo; Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi; Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.