ABÙ ỌMA 3:3-7
ABÙ ỌMA 3:3-7 IGBOB
Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem. M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu. Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.


