Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 3:3-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ ỌMA 3:3-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma gị, ONYENWE ANYị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. Etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eche m nche. A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla. Bilie ONYENWE ANYị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.

ABÙ ỌMA 3:3-7 IGBOB (Bible Nso)

Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem. M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu. Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.